1 Chronicles 7

Ụmụ ụmụ Isaka

1Isaka mụrụ ụmụ anọ:
Tola, na Pua, na Jashub, na Shịmrọn.
2Ụmụ Tola ndị ghọrọ ndịisi ezi bụ ndị a:
Uzi, na Refaya, na Jeriel, na Jamai, na Ibsam, na Samuel. Nʼoge Devid bụ eze, ọnụọgụgụ ndị agha sitere nʼetiti ha dị iri puku abụọ na abụọ, na narị isii. (22,600).
3Uzi mụrụ
Izrahaya.
Izrahaya amụta ndị a:
Maikel, Ọbadaya, Juel na Ishaya. Ha niile bụkwa ndịisi ikwu ha.
4Ndị bụ ndị agha nʼetiti ụmụ ụmụ ha nʼoge Devid bụ eze ruru iri puku atọ na isii (36,000), nʼihi na ha niile lụrụ ọtụtụ ndị inyom, mụọ ọtụtụ ụmụ.
5Ụmụnne ha bụ ndị na-alụ agha bụ ndị agbụrụ Isaka dị iri puku asatọ na asaa (87,000) nʼọnụọgụgụ, dịka e depụtara aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ.

Ụmụ ụmụ Benjamin

6Benjamin mụrụ ndị ikom atọ:
Bela, Beka na Jediael,
7Bela mụrụ ụmụ ise:
Ezbon, Uzi, Uziel, Jerimot na Iri. Ha niile bụ ndịisi ezi. Ọnụọgụgụ ndị agha ha dị iri puku abụọ na abụọ na iri atọ na anọ (22,034). E dekwara aha ndị a niile nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ.
8Ụmụ ndị ikom Beka mụrụ bụ
Zemira, Joash, Elieza, Elioenai, Omri, Jeremot, Abija, Anatot na Alemet.
9Akwụkwọ ebe e dere usoro ọmụmụ ha depụtara aha ndịisi ezinaụlọ, na iri puku ndị agha abụọ na narị abụọ (20,200).
10Jediael mụrụ otu nwa nwoke:
aha ya bụ Bilhan.
Ụmụ Bilhan bụ
Jeush, Benjamin, Ehud, Kenaana, Zetan, Tashish na Ahishaha.
11Ụmụ ndị ikom Jediael ndị a bụ ndịisi ezinaụlọ. E nwere nʼetiti ha ndị agha ọnụọgụgụ ha dị puku iri na asaa na narị abụọ (17,200), ndị nọ na njikere ibu agha.
12Ndị Shupim na ndị Hupim bụ ụmụ ụmụ Er ebe ndị Hushim bụ ụmụ ụmụ Aha.

Ụmụ ụmụ Naftalị

13Ụmụ Naftalị mụtara bụ
Jaziel, Guni, Jeza na Shalum bụ ụmụ Bilha.

Ụmụ ụmụ Manase

14Ụmụ Manase:
Asriel, onye iko ya nwanyị bụ onye Aram mụtara, na Makia. Makia bụ nna Gilead.
15Makia sitere nʼetiti ndị Hupim na Shupim lụọ nwunye. Aha nwanne ya nwanyị bụ Maaka. Otu onye ọzọ si nʼagbụrụ Manase bụ Zelofehad, onye mụtara naanị ụmụ ndị inyom. 16Maaka nwunye Makia mụtara otu nwa nwoke ọ gụrụ Peresh. Aha nwanne ya bụ Sheresh, onye mụtara Ụlam na Rakem.
17Nwa nwoke Ụlam mụtara
bụ Bedan.
Ndị a bụ ụmụ Gilead, nwa nwa Makia, nwa Manase.
18Hamoleket, nwanne nwanyị Makia mụrụ Ishod, Abieza na Mahla.
19Shemida mụrụ ụmụ ikom ndị a:
Ahian, Shekem, Liiki na Aniam.

Ụmụ ụmụ Ifrem

20Ụmụ Ifrem bụ
Shutela, Bered,
Tahat, Eleada,
Tahat
21na Zabad nwa ya,
na Shutela nwa ya.
Eza na Elead bụ ndị gara ịchịkọrọ anụ ụlọ ndị Gat, ndị ikom nwe obodo ahụ jidere ha gbuo ha nʼebe ahụ.
22Ifrem nna ha ruru ụjụ nke ukwuu nʼihi ọnwụ ha, ma ụmụnna ya kasịrị ya obi. 23Mgbe nwunye ya mụrụ nwa nwoke ọzọ, ọ kpọrọ aha ya Beriya, nke pụtara, Ihe ndaba ọjọọ, nʼihi ọnwụ Elead na Eza. 24Aha nwa Ifrem nke nwanyị bụ Sheera. Sheera bụ onye wuru akụkụ ugwu na ndịda Bet-Horon, wuokwa Uzen-Sheera.
25Ndị a bụkwa ụmụ Ifrem: Refa, nna Reshef,
onye bụ nna Tela. Tela bụ nna Tahan,
26onye bụ nna Ladan, Ladan bụ nna Amihud,
onye bụ nna Elishama.
27Elishama bụ nna Nun,
onye bụ nna Joshua.
28Betel na obodo ndị ọzọ gbara ya gburugburu, ya bụ Naaran, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, na Gaza na obodo nta ya, ndị dị nʼọdịda anyanwụ, na Shekem, na obodo ndị ọzọ, tutu ruo Aya, na obodo nta ya niile, so nʼala ha. 29Ụmụ Manase, nwa Josef, nwa nwa Izrel, bikwa nʼobodo ndị a dị nʼoke ala ha: Bet-Shan, na Teanak, na Megido, na Doa, tinyere obodo nta ha niile.

Ụmụ ụmụ Asha

30Asha mụrụ ndị a:
Imna, Ishva, Ishvi na Beriya. Nwa ya nwanyị bụ Sera.
31Beriya amụta ndị a:
Heba na Malkiel, onye bụ nna Biazait.
32Heba bụ onye mụrụ Jaflet, Shoma na Hotam. Nwanne ha nwanyị bụ Shua.
33Ụmụ Jaflet mụrụ bụ
Pasak, Bimhal na Ashvat.
Ndị a bụ ụmụ Jaflet.
34Shoma amụọ
Ahi, Roga, Huba na Aram.
35Nwanne ya nwoke Helem mụrụ
Zofa, Imana, Shelesh na Amal.
36Zofa amụta ndị a:
Sua, Hanefa, Shual, Beri, Imra,
37Beza, Hod, Shama, Shilsha, Itran na Beera.
38Jeta mụtara
Jefune, Pispa na Ara.
39Ụla amụta
Ara, Haniel na Rizia.
40Ụmụ ụmụ Asha ndị a niile bụ ndịisi ezi, ndị a sara anya na mmiri họpụta, ndị bụ dimkpa nʼagha, ndị ndu a ma ama. Ọnụọgụgụ ndị ha tozuru ije agha dị puku iri abụọ na isii (26,000), ndị e depụtara aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ.
Copyright information for IboBIU